Search

WEBSITE SEARCH

To search our database catalog and museum collection see "Collections." 

Search
Close this search box.

Ọ dịghị ka nnukwu ụ́zụ ndi Grik e jiri ọla brass mee
Nke gbasara ụkwụ mmeri ya site n’otu mba ruo na mba ọzọ
Ebe a, n’ọnụ ụzọ anyị nke ọdịda anyanwụ isi mmiri, ka Ọ ga-eguzo
Oke nwanyị ji ọ́kụ tọọchị n’aka, nke ire ọ́kụ ya
Bụ àmụ̀mà eluigwe a tụrụ mkpọrọ; aha ya
Nne ndi a chụpụrụ n’obodo ha. Site n’aka ọkụ ya
Ka ìhè nke nnabata na-enwu; anya ọmiko ya na-enye iwu
Ruo n’àkwà mmiri ukwu abụọ jikọtara obodo
“Chekwa, ala nna anyị ha, emume obi ụtọ e ji mara gi! Ka Ọ na-eti
N’olu dị nwayọọ. “Kpọtara m ndi ike gwụrụ, ndi ogbenye ụnụ,
Ìmèriimè ụnụ ndi na-achọ iku ume nke mnwere onwe
Únyí nke jupụtara n’ọnụ mmiri oke ala ụnụ.
Zitere m ndi a, ndi enweghi ebe obibi, ndi mmiri sọtaara m
E bulie m ọkụ m n’akụkụ ọnụ ụzọ ọlaedo!”